Guidance

Notice of rights and entitlements Igbo (PACE code H) (accessible version)

Updated 11 March 2019

Amụma Iwu Iyi Obodo Egwu 2000

Cheta ikike gị mgbe eji gị eji

Ekwere gị nkwa ikike ndị dị na ọkwa a n’okpuru iwu England na Wales ma gbasokwa EU Directive 2012/13 n’ikike nke ịnata ozi n’usoro ihe gbasara ịda iwu.

Achịkọtara ikike gị n’ọdụ ndị uwe ojii n’ibe akwụkwọ a.

Enwekwara ọtụtụ ozi ndị ọzọ dị na nkeji akwụkwọ 1 ruo 11 n’ibe akwụkwọ na-esote.

Nkọwapụta ya n’uju dị na Usoro nke Omume H ndị uwe ojii.

  1. Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ịchọrọ ka onye ọka iwu nyere gị aka mgbe ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii. Nke a bụ n’efu.

  2. Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ịchọrọ ka agwa mmadụ ebe ịnọ. Nke a bụ n’efu.

  3. Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ịchọrọ ịlebanye anya n’iwu ha – a na-akpọ ha Usoro nke Omume.

  4. Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ịchọrọ enyemaka ahụike. Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ahụ adịghị gị ma ọ bụ na ịmerụrụ ahụ. Enyemaka ahụike bụ n’efu.

  5. Ọ bụrụ na ajụọ gị ajụjụ gbasara itinye aka na nguzobe, nkwado ma ọ bụ nkwanye omume iyi obodo egwu nke a na-enyo enyo, ị nwere ike ịgaghị ekwu ihe ọ bụla. Kaosiladị, ọ nwere ike imebi ngọpụta onwe gị ma ọ bụrụ na ikwupụtaghị mgbe ajụrụ gị ajụjụ ihe bụ nke ị ga-atụkwasị obi n’ụlọ ikpe ma emechaa. Enwere ike iji ihe ọ bụla nke ikwuru nye ya ka akaebe.

  6. Onye uwe ojii ga-agwarịrị gị gbasara ụdị itinye aka na nguzobe, nkwado ma ọ bụ nkwanye omume iyi obodo egwu nke a na-enyo enyo nke ha chere n’isonyere yana ihe kpatara eji nwudo gị ma jide gị.

  7. Onye uwe ojii ga-ahapụrịrị gị ma ọ bụ onye ọka iwu gị ka ọ hụ ndekọ na akwụkwọ gbasara ihe kpatara eji nwudo ma jide gị yana oge gị n’ọdụ ndị uwe ojii.

  8. Ọ bụrụ na ịchọrọ onye ntụgharị okwu, onye uwe ojii ga-ahapụrịrị gị ka ị nweta otu. ḷ nwekwara ike ịme ụfọdụ akwụkwọ ntụgharị. Nke a bụ n’efu.

  9. Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ịbụghị onye mba Britain na ịchọrọ ịkpọtụrụ ụlọ ọrụ nnọchite obodo gị ma ọ bụ kọnsulet gị ma ọ bụ na ịchọrọ ka agwa ha na-ejidere gị. Nke a bụ n’efu.

  10. Ndị uwe ojii ga-agwarịrị ogologo oge ole ha ga-ejide gị.

  11. Ọ bụrụ na-agba gị akwụkwọ ebubo, ewepụ okwu gị n’ụlọ ikpe, gị ma ọ bụ onye ọka iwu gị nwere ikike ịhụ akaebe eji boo gị ebubo tupu ụlọ ikpe amalite ịnụrụ okwu ahụ.

Ọ bụrụ na ikike ndị a nke ọ bụla edoghị gị anya, gwa onye uwe ojii na-ahụ maka njide gị

Hụ ibe akwụkwọ dị ma nchịkọta gachaa maka ọtụtụ ozi ndị ọzọ gbasara ka ndị uwe ojii ga-esi meso gị omume ma lekọta gị

Ụdị Ọkwa nke Ikike na Elele a ga-amalite ịdị ire site na 1 Disemba 2018

Biko dobe ozi a ma gụọ ya ozugbo ị nwere ike. Ọ ga-enyere gị aka ịme mkpebi mgbe ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii.

1. ḷ nweta onye ọka iwu ka ọ nyere gị aka

  • Onye ọka iwu nwere ike ịnyere gị aka ma nye gị ndụmọdụ gbasara iwu.
  • ḷrịọ ka gị na onye ọka iwu kpaa agaghị eme ka ọ dị ka ịmere ihe dị njo.
  • Onye Uwe Ojii na-ahụ maka Njide ga-ajụrịrị gị ma ịchọrọ ndụmọdụ gbasara iwu. Nke a bụ n’efu.
  • Onye uwe ojii ga-ahapụrịrị gị ka gị na onye ọka iwu kpaa n’oge ọ bụla, n’ehihie ma ọ bụ n’abalị, mgbe ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii.
  • Ọ bụrụ na ịrịọ maka ndụmọdụ gbasara iwu, anaghị enyekarị ndị uwe ojii ohere ka ha jụọ gị ajụjụ ruo mgbe ị nwere ohere ka gị na onye ọka iwu kpaa. Mgbe ndị uwe ojii na-ajụ gị ajụjụ ị nwere ike ịrịọ ka gị na onye ọka iwu nọrọ n’ịme ụlọ ahụ.
  • Ọ bụrụ na ịgwara onye uwe ojii na ịchọghị ndụmọdụ gbasara iwu mana mechaa gbanwee obi gị, gwa onye uwe ojii na-ahụ maka njide gị bụ onye nke ga-enyere gị aka kpọtụrụ onye ọka iwu.
  • Ọ bụrụ na onye ọka iwu abịaghị ma ọ bụ kpọtụrụ gị n’ọdụ ndị uwe ojii, ma ọ bụ na ịchọrọ ka gị na onye ọka iwu kpaa ọzọ, rịọ onye uwe ojii ka ọ kpọtụrụ ha ọzọ.
  • Ị nwere ike ịrịọ ka gị na onye ọka iwu ịma kpaa ma ịgaghị akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na ha na-arụ ọrụ enyemaka gbasara iwu. Ọ bụrụ na ọ nweghị onye ọka iwu ịma ma ọ bụ na enweghị ike ịkpọtụrụ onye ọka iwu ịmaara, ị nwere ike gị na onye ọka iwu nọ n’ọrụ akpaa. Nke a bụ n’efu.
  • Onye ọka iwu nọ n’ọrụ enweghị ihe jikọrọ ya na ndị uwe ojii.

Iji hazie ndụmọdụ gbasara iwu bụ n’efu:

  • Ndị uwe ojii ga-akpọtụrụ Defence Solicitor Call Centre (DSCC). Ndị DSCC ga-ahazi ka ndụmọdụ gbasara iwu site n’aka onye ọka iwu nke ịrịọrịọ ma ọ bụ Onye Ọka Iwu nọ Ọrụ.
  • Ndị DSCC bụ ndị ọrụ nọrọ onwe ha, ọrụ ha bụ ịhazi ndụmọdụ gbasara iwu n’enweghị ihe ọ bụla gbasara ha na ndị uwe ojii.

Ọ bụrụ na ịchọrọ ịkwụ ụgwọ ndụmọdụ gbasara iwu n’aka gị:

  • N’okwu niile ị nwere ike ịkwụ ụgwọ ndụmọdụ gbasara iwu ma ọ bụrụ na ịchọrọ.
  • Mgbe amachiri ndụmọdụ gbasara iwu bụ n’efu n’ekwentị nke sitere n’aka CDS Direct, ị ka nwere ike ịgwa onye ọka iwu nke gị okwu n’ekwentị ma ọ bụrụ na ị chọrọ, mana agaghị akwụ ha ụgwọ maka enyemaka gbasara iwu, enwere ike ịgwa gị ka ị kwụọ ụgwọ. DSCC ga-akpọtụrụ onye ọka iwu gị na nnọchite anya gị.
  • Ị nwere ikike ịgwa onye ọka iwu gị okwu na nzuzo gị n’ekwentị ma ọ bụ ha nwere ike kpebie ịbịa hụ gị n’ọdụ ndị uwe ojii.
  • Ọ bụrụ na enweghị ike ịkpọtụrụ onye ọka iwu nke ịhọtara, ndị uwe ojii ka nwere ike ịkpọ DSCC iji hazie ndụmọdụ gbasara iwu bụ n’efu site n’aka Onye Ọka Iwu Nọ Ọrụ.

2. Ịgwa mmadụ na ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii

  • Ị nwere ike ịgwa ndị uwe ojii ka ha kpọtụrụ onye kwesịrị ịma na ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii. Nke a bụ n’efu.
  • Ha ga-akpọtụrụ gị mmadụ ozugbo ha nwere ike.

3. Ịlebanye anya N’Usoro nke Omume

  • Usoro nke Omume bụ iwu ndị na-agwa gị ihe onye uwe ojii nwere ike ịme ma ọ bụ nke ọ nweghị ike ịme mgbe ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii. Ha gụnyere nkọwa ikike nke achịkọtara na ọkwa a.
  • Ndị uwe ojii ga-ahapụ gị ka ịgụọ Usoro nke Omume, mana ị gaghị emenwu nke a ma ọ bụrụ na ọ ga-egbochi onye uwe ojii ịchọpụta ma ịdara iwu.
  • Ọ bụrụ na ịchọrọ ịgụ Usoro nke Omume, gwa Onye Uwe Ojii na-ahụ maka Njide.

4. Ị nweta enyemaka ahụike ma ọ bụrụ n’ahụ adịghị gị ma ọ bụ na ịmerụrụ ahụ

  • Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ahụ adịghị gị ma ọ bụ na ịchọrọ ọgwụ ma ọ bụ na ịmerụrụ ahụ. Ha ga-akpọ onye dọkịta ma ọ bụ nọọsụ ma ọ bụ onye ọkachamara nlekọta ahụike na ọ bụ n’efu.
  • Enwere ike ịnye gị ohere ka irie ọgwụ nke gị, mana onye uwe ojii ga-ebu ụzọ nyocha ya. Onye nọọsụ ga-ebụkarị ụzọ hụ gị, mana onye uwe ojii ga-akpọ dọkịta ma ọ bụrụ na ịchọrọ otu. Ị nwere ike ịrịọ ka ịhụ dọkịta ọzọ mana ị nwere ike bụrụ onye ga-akwụ ụgwọ nke a.

5. Ikike nke ịnọ juu

Ọ bụrụ na-ajụọ gị ajụjụ gbasara itinye aka na nguzobe, nkwado ma ọ bụ nkwanye omume iyi obodo egwu nke a na-enyo enyo , ị nwere ike ịgaghị ekwu ihe ọ bụla.

Kaosiladị, ọ nwere ike imebi ngọpụta onwe gị ma ọ bụrụ na ikwupụtaghị mgbe ajụrụ gị ajụjụ ihe bụ nke ị ga-atụkwasị obi n’ụlọ ikpe ma emechaa.

Enwere ike iji ihe ọ bụla nke ikwuru nye ya ka akaebe.

6. ḷmata ihe kpatara eji nwudo ma jide gị

  • Ndị uwe ojii ga-enyerịrị gị ozi ka ịwere nwee ike ghọta ihe kpatara eji nwudo gị ma na-enyo n’itinyere aka na nguzobe, nkwado ma ọ bụ nkwanye omume iyi obodo egwu.
  • N’ọdụ ndị uwe ojii, ndị uwe ojii ga-agwarịrị gị ihe kpatara ha jiri kwenye na ekwesịrị ka ijide gị.
  • Tupu ajụọ gị ajụjụ ọ bụla gbasara itinye aka na omume iyi obodo egwu nke a na-enyo enyo, ndị uwe ojii ga-enyerịrị gị ma ọ bụ onye ọka iwu gị ozi zuru ezu gbasara ihe ndị ha na-eche na ịmere ka ị nwee ike gọrọ onwe gị, mana ọ bụ n’emeghị nyocha ndị uwe ojii.
  • Nke a metụtara ịda iwu ndị ọzọ nke ndị uwe ojii na-enyo gị enyo.

7. ḷhụ ndekọ na akwụkwọ gbasara nwudo gị na njide gị

  • Mgbe ejidere gị n’ọdụ ndị uwe ojii, ndị uwe ojii ga:
    • Edekọba na ndekọ njide gị, ihe kpatara yana mkpa ọ dị inwudo gị yana ihe mere ha ji kwenye na a ga-ejide gị.
    • Ahapụ gị na onye ọka iwu gị ka unu lelee ndekọ ahụ. Onye uwe ojii na-ahụ maka njide ga-ahazi nke a.
  • Ndị uwe ojii ga-ahapụrịrị gị ma ọ bụ onye ọka iwu gị ị nweta akwụkwọ na ihe ndị dị mkpa iji nyere aka lụso ọgụ nke ọma nwudo na njide gị ka o siri gbaso iwu.

8. Ị nweta onye ntụgharị okwu yana ntụgharị akwụkwọ ụfọdụ iji nyere gị aka

  • Ọ bụrụ na ịnaghị asụ ma ọ bụ ghọta Bekee, ndị uwe ojii ga-ahazi onye na-asụ asụsụ gị iji nyere gị aka. Nke a bụ n’efu.
  • Ọ bụrụ na nti chiri gị ma ọ bụ na ị nwere nhịahụ ikwu okwu, ndị uwe ojii ga-ahazi onye ntụgharị okwu Ji Aka Akparịta Ụka nke Britain iji nyere gị aka. Nke a bụ n’efu.
  • Ọ bụrụ na ịnaghị asụ ma ọ bụ ghọta Bekee, ndị uwe ojii ga-achọta onye ntụgharị okwu iji gwa gị ihe kpatara eji jide gị. A ga-eme nke a oge ọ bụla emere mkpebi ịhapụ gị n’ime mkpọrọ.
  • Ka emachara mkpebi nke ọ bụla idobe gị n’ụlọ mkpọrọ yana ka agbachara gị akwụkwọ ebubo ịda iwu ọ bụla, ndị uwe ojii ga-enyerịrị gị ndekọ nke gị n’asụsụ gị, ihe kpatara ejiri jide gị yana ịda iwu nke ejiri gbaa gị akwụkwọ ebubo, belụsọ ma enwere ihe ndị pụrụiche kpatara ya na agaghị eme nke a. Ndị a bụ:
    • Ọ bụrụ na ikpebie na ịchọghị ndekọ ahụ iji gọrọ onwe gị n’ihi na ịghọtara nke ọma ihe na-eme yana nsonazụ nke enweghị ndekọ ahụ, na ị nweela ohere ịrịọ onye ọka iwu ka ọ nyere gị aka mee mkpebi. Ị ga-enyerịrị nkwenye gị na ederede.
    • Ọ bụrụ na inwe ntụgharị ọnụ okwu ma ọ bụ nchịkọta sitere na onye ntụgharị okwu kama ntụgharị edere ede ga-ezuru gị ịgọrọ onwe gị ma ghọta nke ọma ihe na-eme. Onye na-ahụ maka njide ga-enyekwa ikikere nke a.
  • Mgbe ndị uwe ojii na-ajụ gị ajụjụ na emeghị ndekọ odiyo, onye ntụgharị okwu ga-eme ndekọ ajụjụ na azịza ndị ahụ n’asụsụ gị. Ị ga-enwe ike nyocha nke a tupu ibinye aka na ya dịka ndekọ ziri ezi.
  • Ọ bụrụ na ịchọrọ ịnye ndị uwe ojii akwụkwọ akụkọ, onye ntụgharị okwu ga-eme ṅomi akwụkwọ akụkọ ahụ n’asụsụ gị maka gị inyocha wee binye aka dịka nke ziri ezi.
  • Ị nwekwara ikike ị nweta ntụgharị Ọkwa a. Ọ bụrụ na ntụgharị okwu adịghị, a ga-enyerịrị gị ozi ahụ site n’onye ntụgharị okwu ma nye gị ntụgharị okwu n’egbughị oge ọ bụla.

9. ḷkpọtụrụ ụlọ ọrụ ndị nnọchite obodo gị ma ọ bụ kọnsulet

Ọ bụrụ na ịbụghị onye mba Britain, ị nwere ike gwa ndị uwe ojii na ịchọrọ ịkpọtụrụ Ụlọ Ọrụ Isi Obodo gị, Ụlọ Ọrụ Nnọchite Obodo gị ma ọ bụ Kọnsulet iji gwa ha ebe ịnọ na ihe kpatara iji nọrọ n’ọdụ ndị uwe ojii. Ha nwekwara ike bịa leta gị na nzuzo ma ọ bụ hazie ka onye ọka iwu hụ gị.

10. Ogologo oge ole enwere ike ijide gị

  • Enwere ike iji gị ihe karịrị aka elekere 24 na agbaghị gị akwụkwọ ebubo ọ bụla. Nke a nwere ike ito ogologo karịa ma ọ bụrụ na ọka ikpe nwere ike ikpebi mpụ ahụ yana juri nọ n’ụlọ ikpe na Supritendant Ndị Uwe Ojii ma ọ bụ na ụlọ ikpe hapụrụ ya ka ọ mee. Ka aka elekere 36 gachara, naanị ụlọ ikpe nwere ike ịhapụ ndị uwe ojii ọzọ iji jide gị na agbaghị gị akwụkwọ ebubo ọ bụla.
  • Kwa mgbe, kwa mgbe onye isi na ndị uwe ojii ga-elebanyerịrị anya n’okwu gị iji hụ ma ọ ka kwesịrị ka edobe gị n’ọdụ ndị uwe ojii. A na-akpọ nke a nyocha, onye uwe ojii ahụ bụ onye uwe ojii na eme nyocha. Belụsọ ma ị nọghị n’ọnọdụ ahụ izu oke, ị nwere ikike ikwu okwu banyere mkpebi a n’ọdịde ma ọ bụ site na ịgwa onye uwe ojii na eme nyocha ahụ n’onwe gị ma ọ bụ na njikọ igwe onyonyoo. Onye ọka iwu gị nwekwara ikike ikwu okwu banyere nke a na nnọchite anya gị.
  • Ọ bụrụ na onye ọrụ nyocha ahapụghị gị, a ga-agwarịrị gị ihe kpatara ya ma dekọba ihe kpatara ya na ndekọ njide gị.
  • Ọ bụrụ na njide gị adịghịzị mkpa, a ga-ahapụrịrị gị. Ọ bụrụ na ndị uwe ojii gwa gị na ha chọrọ ịmalitekwa inyocha mpụ ahụ, a ga-ahapụ gị site na mgbapụta ma ọ bụ na akwụghị ụgwọ ọ bụla. Ọ bụrụ na agbapụtara gị, a gaenyerịrị gị ọkwa edere ede iji gwa gị na ị ga-alaghachiteriri n’ọdụ ndị uwe ojii yana gbasara ọnọdụ ọ bụla nwere ike ịmetụta mgbapụta gị.
  • Mgbe ndị uwe ojii chọrọ ịrịọ ụlọ ikpe ka ha gbatịa njide gị:
    • A ga-enyerịrị gị ọkwa edere ede na agwa gị mgbe ikpe ahụ ga-eme yana ihe ndị kpatara eji achọ ịdọtị njide gị.
    • A ga-edoteriri gị n’ụlọ ikpe maka ikpe ahụ belụsọ na atọlitere njikọ igwe onyonyoo, ka ị nwee ike ịhụ ma nụ ndị mmadụ nọ n’ụlọ ikpe, ha enwekwaa ike ịhụ ma nụ gị.
    • Ị nwere ikike ịnwe onye ọka iwu oge ịnọ n’ụlọ ikpe.
    • A ga-enye ndị uwe ojii ohere idobe gị n’ụlọ mkpọrọ naanị ma ọ bụrụ na ụlọ ikpe ekwenye na ọ dị mkpa yana na ndị uwe ojii ji mkpachapụ anya enyocha okwu gị n’etufughị oge.
  • Ọ bụrụ na ndị uwe ojii nwere akaebe zuru oke iji zipu gị ụlọ ikpe, enwere ike gbaa gị akwụkwọ ebubo n’ọdụ ndị uwe ojii ma ọ bụ site na nzipu leta, ka ịbịa n’ụlọ ikpe ka anụrụ ikpe gị.

Nyocha na mgbatị njide

  • Enwere ike nwee oge a ga-ejide karịa aka elekere 48 mgbe anwudochara gị. N’ọnọdụ ndị a, a ga-enyerịrị gị ihe ndị a:
    • Akwụkwọ edere ede na emeela akwụkwọ anamachọihe iji gbatị njide gị.
    • Oge emere akwụkwọ anamachọihe ahụ.
    • Oge a ga-anụrụ akwụkwọ anamachọihe ahụ n’ụlọ ikpe yana
    • Ihe ndị kpatara ejiri achọ ka agba n’ihu na njide ahụ.

A ga-enyerịrị gị ọkwa (yana onye nnọchi anya gbasara iwu gị) oge ọ bụla emere akwụkwọ anamachọihe iji gbatị ma ọ bụ gaba n’ihu gbatịa njide gị.

11. Ohere nnweta akaebe ma ọ bụrụ na okwu gị pụọ n’ụlọ ikpe.

Ọ bụrụ na agbaa gị akwụkwọ ebubo ịda iwu, a ga-ahapụrịrị gị ma ọ bụ onye ọka iwu gị ka ọ hụ akaebe ahụ megidere gị yana akaebe nke nwere ike ịnyere gị aka gọrọ onwe gị. A ga-emerịrị nke a tupu nnụrụ ikpe gị amalite. Ọ bụ ọrụ ndị uwe ojii na ndị Ọrụ Crown Prosecution ịhaziriri nke a ma nye ohere ịnweta akwụkwọ na ihe ndị dị mkpa.

Ihe ndị ọzọ ị ga-amata gbasara ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii

Otu ekwesịrị isi meso gị omume ma lekọta gị

Ndị a bụ nkenke ederede na agwa gị gbasara ihe ị nwere ike ịtụ anya ya ka edobere gị n’ọdụ ndị uwe ojii. Iji chọpụtakwuo, rịọ ka ịhụ Usoro nke Omume. Ha gụnyere ndepụta ebe ịga ahụ ọtụtụ ozi gbasara nke ọ bụla n’ime ndị a. Jụọ onye uwe ojii naahụ maka njide ma ọ bụrụ na ị nwere ajụjụ ọ bụla.

Ndị chọrọ enyemaka

  • Ọ bụrụ na irubeghị 18 ma ọ bụ ị dịghị ike, ọmụmatụ ọ bụrụ na ị nwere nhịahụ mmụta ma ọ bụ nsogbu ahụike ọgụgụ isi, yabụ na ị nwere ikike ka gị na mmadụ nọrọ mgbe ndị uwe ojii na-eme ụfọdụ ihe. Onye a ka a na-akpọ “okenye tozuru etozu” nke gị yana a ga-enye ha ṅomi nke Ọkwa a.
  • Okenye gị tozuru etozu ga-enyere gị ghọta ihe na eme ma lekọta gị anya. Onye ahụ ga-anọnyerịrị gị mgbe ndị uwe ojii na-agwa gị gbasara ikike gị ma gwa gị ihe kpatara eji dobe gị n’ọdụ ndị uwe. Onye ahụ ga-anọnyerịrị kwa gị mgbe ndị uwe ojii na-agụpụtara gị ịdọ aka ntị ndị uwe ojii.
  • Okenye gị tozuru etozu nwekwara ike rịọ maka onye ọka iwu na nnọchite anya gị.
  • Ị nwere ike ịgwa onye ọka iwu gị okwu n’enweghị okenye gị tozuru etozu n’ịme ụlọ ahụ ma ọ bụrụ na ịchọrọ.
  • Ndị uwe ojii nwekwara ike ịme otu n’ime ihe ndị edepụtara n’okpuru ka ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii. Belụsọ na enwere ihe ndị pụrụ iche, okenye gị tozuru etozu ga-anọnyerịrị gị mgbe niile, belụsọ ma enwere ihe pụrụiche kpatara ya ma ọ bụrụ na ndị uwe ojii na-eme otu n’ime ihe ndị a :
    • ḷjụ gị ajụjụ ma ọ bụ sị gị binye aka n’akwụkwọ akụkọ edere ede ma ọ bụ akwụkwọ ndetu onye uwe ojii.
    • Iyipu ihe karịrị otu akwa mpụga gị iji mee gị nyocha.
    • Nara mbisa mkpịsị aka gị, foto ma ọ bụ DNA ma ọ bụ ihe nlele ọzọ..
    • ḷme ihe ọ bụla metụtara usoro nchọpụta onye akaebe hụrụ ihe mere.
  • Okenye gị tozuru etozu kwesịrị ka enye ya ohere ka ọ nọrọ n’onwe ya ya ma ọ bụ n’ekwentị iji nyere gị aka, mgbe ndị uwe ojii na-enyocha okwu gị iji hụ ma ekwesịrị ịgaba n’ihu jide gị.
  • Ọ bụrụ na okenye gị tozuru etozu nọ, ha ga-anọrịrị mgbe ndị uwe ojii na-agba gị akwụkwọ ebubo maka ịda iwu.

Ị nweta nkọwapụta oge gị n’ọdụ ndị uwe ojii

  • A na-edekọba ihe niile nke mere gị mgbe ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii. Nke a ka a naakpọ Ndekọ Njide.
  • Mgbe ịhapụrụ ọdụ ndị uwe ojii, gị, onye ọka iwu gị ma ọ bụ okenye gị tozuru etozu nwere ike ịrịọ maka otu ṅomi Ndekọ Njide ahụ. Ndị uwe ojii ga-enye gị otu ṅomi nke Ndekọ Njide gị ozugbo ha nwere ike.
  • Ị nwere ike ịjụ ndị uwe ojii maka otu ṅomi nke Ndekọ Njide gị ruo ọnwa 12 ka ịhapụchara ọdụ ndị uwe ojii.

Na akpọtụrụ

  • N’ikwuru onye ọka iwu yana ịgwa mmadụ gbasara nwudo emere gị, a na-ahapụkarị gị ka ịmee otu oku ekwentị.
  • Rịọ ndị uwe ojii ma ọ bụrụ na ịchọrọ ịkpọ oku ekwentị.
  • Ị nwekwara ike ịrịọ maka mkpịsị odee na akwụkwọ.
  • Ị nwere ike nwee ohere ịnabata ndị ọbịa mana onye na-ahụ maka njide nwere ike jụ ịnabata nke ahụ.

Ụlọ mkpọrọ gị

  • Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ọmụme, ekwesịrị idobe gị n’ụlọ mkpọrọ nke gị.
  • Ọ kwesịrị ịdị ọcha, nwee okpomọkụ ma nwee ọkụ.
  • Ihe mgbakwasa akwa gị kwesịrị ịdị ọcha ma dị n’ọnọdụ dị mma.
  • Ekwesịrị ka ahapụ gị ka ijiri ụlọ mposi ma sachaa ahụ.

Akwa

Ọ bụrụ na anara gị akwa gị, mgbe ahụ ndị uwe ojii ga-enyerịrị gị ụdị akwa ọzọ.

Nri na ihe ọṅụṅụ

A ga-enyerịrị gị nri ugboro 3 n’ụbọchị yana ihe ọṅụṅụ. Ị nwekwara ike ịṅụ ihe ọṅụṅụ n’etiti nri.

Mgbatị ahụ

Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ọmụme, ekwesịrị ịhapụ gị ka ịpụọ ilo kwa ụbọchị nara ikuku ọma.

Mgbe ndị uwe ojii na-ajụ gị ajụjụ

  • Ime ụlọ ahụ kwesịrị ịdị ọcha, nwee okpomọkụ ma nwee ọkụ.
  • Ọ kwesịghị na ị ga-akwụ ọtọ.
  • Ndị uwe ojii ahụ kwesịrị ịgwa gị aha ha na ọkwa ha.
  • Ị kwesịrị inwe oge izu ike na oge iri nri na oge ịṅụ ihe ọṅụṅụ ka aka elekere abụọ gachara.
  • Ekwesịrị ka enye gị ọbụlagodi aka elekere 8 iji rahụ ụra n’ime aka elekere 24 ọ bụla emere gị njide.

Agụụ Okwukwe

Gwa ndị uwe ojii ma ọ bụrụ na ịchọrọ ihe ọ bụla iji nyere gị aka ịme okpukpe gị mgbe ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii. Ha nwere ike ịnye gị akwụkwọ ụka na ihe ndị ọzọ, ka o siri dị mkpa.

Oge iwu nkịtị na-adị iche

Ị nweta onye ọka iwu ka ọ nyere gị aka

A na-enwe oge mgbe ndị uwe ojii ga-achọ ịjụ gị ajụjụ ọsọ ọsọ tupu gị na onye ọka iwu gị akpakọrịta. Enyere ozi gbasara ndị a na Usoro nke Omume. Ndị a, na-edepụta ihe ndị uwe ojii nwere ike ịme na nke ha enweghị ike ịme ka ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii. Ọ bụrụ na ịchọrọ ịlebanye anya na nkọwapụta ha, ha dị na nkeji akwụkwọ 6.7 nke Koodu H nke Usoro nke Omume.

Ọ nwere otu oge mgbe ndị uwe ojii agaghị ekwe ka gị na onye ọka iwu ịhọpụtara kpakọrịta. Ọ bụrụ na nke a mee, a ga-ahapụrịrị gị ka ịhọrọ onye ọka iwu ọzọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịlebanye anya na nkọwapụta ha, ha dị na Mgbakwunye B nke Koodu H nke Usoro nke Omume.

Enwere otu oge mgbe ndị uwe ojii agaghị ekwe ka gị na onye ọka iwu gị kwukọrịta na nzuzo. Nke a bụ mgbe onye isi uwe ojii na-enye ikikere ka ịnspektọ yi uwe ọrụ nọrọ ebe ahụ. Ọ bụrụ na ịchọrọ ịlebanye anya na nkọwapụta ha, ha dị na nkeji akwụkwọ 6.5 nke Koodu H nke Usoro Omume.

ḷgwa mmadụ na ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii

Enwere oge mgbe ndị uwe ojii agaghị ekwe ka ịkpọtụrụ onye ọ bụla. Enyere ozi gbasara oge ndị a na Usoro nke Omume. Ọ bụrụ na ịchọrọ ịlebanye anya na nkọwapụta ha, ha dị na Mgbakwunye B nke Koodu H nke Usoro nke Omume.

Ndị Ọbịa Ndị Eji Eji Nọrọ Onwe ha

Enwere ndị ọbịa bi n’ogbe a na-enye ohere ịbata n’ọdụ ndị uwe ojii n‘amaghị ọkwa. Amaara ha dịka ndị ọbịa ndị eji eji nọrọ onwe ha, ha na-arụ ọrụ akwụ ụgwọ ka ewere hụ na a na-elekọta ndị eji eji nke ọma ma nwee ike nweta ikike ha.

Ị nweghị ikike ọ bụla ịhụ onye ọbịa ndị eji eji nọrọ onwe ha ma ọ bụ ịrịọ ha ka ha bịa leta gị mana onye ọbịa nwere ike ịrịọ ka ọ bịa leta gị. Ọ bụrụ na onye ọbịa ndị eji eji nọrọ onwe ha abịa leta gị mgbe ịnọ na mkpọrọ, ha na-emere onwe ha nke a n’enweghị mkpakọ n’etiti ha na ndị uwe ojii iji lelee ma echedoro ọdịmma gị na ikike gị. Agbanyeghị, ọ bụghị iwu na ị ga-agwa ha okwu ma ọ bụrụ na ịchọghị.

Otu esi eme mkpesa

Ọ bụrụ na ịchọrọ ịkpesa gbasara otu esiri meso gị omume, rịọ ka gị na onye uwe ojii bụ ịnspektọ ma ọ bụ ọkwa karịrị kpakọrịta. Mgbe ahapụchara gị, ị nwekwara ike ịme mkpesa n’ọdụ ndị uwe ojii ọ bụla n’aka Independent Police Complaints Commission (IPCC) ma ọ bụ site n’onye ọka iwu ma ọ bụ MP gị na nnọchite anya gị.