Guidance

Notice of rights and entitlements Igbo (PACE Code C) (accessible version)

Updated 11 March 2019

Cheta ikike gị mgbe eji gị eji

Ikike a bụ ndị enyere gi n’okpuru iwu England na Wales ma gbasokwa EU Directive 2012/13 n’ikike nke ịnata ozi n’usoro ihe gbasara ịda iwu.

Achịkọtara ikike gị n’akandị uwe ojii n’ibe akwụkwọ a.

Enwekwara ọtụtụ ozi ndị ọzọ na nkeji akwụkwọ 1 ruo 11 n’ibe akwụkwọ na-eso ndị a. Nkọwapụta ya n’ụzọ zuru ezu dị na Ndekọ C nke ndị uwe ojii ji arụ ọrụ.

  1. Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ịchọrọ ka onye ọka iwu nyere gị aka mgbe ịnọ n’aka ndị uwe ojii. Nke a bụ n’efu.
  2. Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ịchọrọ ka agwa mmadụ ebe ịnọ. Nke a bụ n’efu.
  3. Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ịchọrọ ịlebanye anya n’iwu ha – a na- akpọ ha Usoro ndị uwe ojii ji arụ ọrụ.
  4. Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ịchọrọ enyemaka ahụike. Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ahụ adịghị gị ma ọ bụ na ịmerụrụ ahụ. Enyemaka ahụike bụ n’efu.
  5. Ọ bụrụ na ajụọ gị ajụjụ gbasara ịda iwu a na-enyo enyo, ị nwere ike ịgaghị ekwu ihe ọ bụla. Kaosiladị, ọ nwere ike imebi ngọpụ onwe gị ma ọ bụrụ na ikwupụtaghị mgbe ajụrụ gị ajụjụ ihe bụ nke ị ga-atụkwasị obi n’ụlọ ikpe ma emechaa. Enwere ike iji ihe ọ bụla nke ikwuru nye ya ka akaebe.
  6. Onye uwe ojii ga-agwarịrị gị gbasara iwu nke ha chere n’ịdara yana ihe kpatara eji jide gị ma debekwa gị.
  7. Onye uwe ojii ga-ahapụrịrị gị ma ọ bụ onye ọka iwu gị ka ọhụ ndekọ na akwụkwọ gbasara ihe kpatara eji jide gị ma debekwa gị yana oge gị n’aka ndị uwe ojii.
  8. Ọ bụrụ na ịchọrọ onye ntụgharị okwu, onye uwe ojii ga-enwetarịrị gị otu.. ḷ nwekwara ike ịme ụfọdụ akwụkwọ ntụgharị. Nke a bụ n’efu.
  9. Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ịbụghị onye BritenBritain na ịchọrọ ịkpọtụrụ ụlọ ọrụ nnọchite obodo gị ma ọ bụ kọnsulet gị ma ọ bụ na ịchọrọ ka agwa ha na-ejidere gị. Nke a bụ n’efu.
  10. Ndị uwe ojii ga-ekwurịrị ogologo oge ole ha ga-edebe gị n’aka ha.
  11. Ọ bụrụ na-agba gị akwụkwọ ebubo, ewepụ okwu gị n’ụlọ ikpe, gị ma ọ bụ onye ọka iwu gị nwere ikike ịhụ akaebe eji boo gị ebubo tupu ụlọ ikpe amalite ịnụrụ okwu ahụ.

Ọ bụrụ na ikike ndị a nke ọ bụla edoghị gị anya, gwa onye uwe ojii na-ahụ maka okwu gị.

Hụ ibe akwụkwọ ndị enwere ma nchịkọta gachaa maka ụzọ ndị uwe ojii ga-esi meso gị omume ma lekọta gị.

Ozi ndekọ a na ikike a n’ihe ndị ọzọ so ya ga-ebido ọrụsite 1 December 2018

Biko dobe ozi a ma gụọ ya ozugbo ị nwere ike. Ọ ga-enyere gị aka ịme mkpebi mgbe ịnọ n’aka ndị uwe ojii.

1. ỊNweta onye ọka iwu ka o nyere gị aka

  • Onye ọka iwu nwere ike ịnyere gị aka ma nye gị ndụmọdụ gbasara iwu.
  • ḷrịọ ka gị na onye ọka iwu kpaa agaghị eme ka ọ dị ka ịmere ihe dị njo.
  • Onye Uwe ojii na-ahụ maka okwu gị ga-ajụrịrị gị ma ịchọrọ ndụmọdụ gbasara iwu. Nke a bụ n’efu.
  • Onye uwe ojii ga-ahapụrịrị gị ka gị na onye ọka iwu kpaa n’oge ọ bụla, n’ehihie ma ọ bụ n’abalị, mgbe ịnọ n’aka ndị uwe ojii.
  • Ọ bụrụ na ịrịọrịọ maka ndụmọdụ gbasara iwu, anaghị enyekarị ndị uwe ojii ohere ka ha jụọ gị ajụjụ ruo mgbe inwere ohere ka gị na onye ọka iwu kpaa. Mgbe ndị uwe ojii na-ajụ gị ajụjụ, inwere ike ịrịọ ka gị na onye ọka iwu nọrọ n’ịme ụlọ ahụ.
  • Ọ bụrụ na ịgwara onye uwe ojii na ịchọghị ndụmọdụ gbasara iwu mana mechaa gbanwee obi gị, gwa onye uwe ojii na-ahụ maka okwu gị bụ onye nke ga-enyere gị aka kpọtụrụ onye ọka iwu.
  • Ọ bụrụ na onye ọka iwu abịaghị ma ọ bụ kpọtụrụ gị n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, ma ọ bụ na ịchọrọ ka gị na onye ọka iwu kpaa ọzọ, rịọ onye uwe ojii ka ọkpọtụrụ ha ọzọ.

Ndụmọdụ gbasara iwu bụ n’efu gbasara okwu ndị adịghị oke mkpa:

  • N’ụfọdụ okwu ndị metụtara okwu esighị ike, ebelatara ndụmọdụ gbasara iwu ka ọ bụrụ ndụmọdụ ekwentị sitere n’aka ndị ndụmọdụ tozuru etozu si n’aka Criminal Defence Service (CDS) ma ewezuga ihe metụtara ihe ụfọdụ mgbe onye ọka iwu kwesịrị ịbịa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, dị ka:
    • ọ bụrụ na onye uwe ojii chọrọ ịjụ gị ajụjụ gbasara ịda iwu ma ọ bụ mee usoro nchọpụta onye akaebe hụrụ ihe mere.
    • ịchọrọ enyemaka “okenye tozuru etozu”. Hụ “ndị chọrọ enyemaka”.
    • ị nweghị ike ịkparịta ụka n’ekwentị, ma ọ bụ ,
    • Mkpesa siri ike maka mkpaso agwa ọjọọ sitere n’aka ndị uwe ojii.

Mgbe ndụmọdụ bụ n’efu ejedebeghị sọ na ekwentị sitere na CDS Direct:

  • Ị nwere ike ịrịọ ka gị na onye ọka iwu ịma kpaa mana ịgaghị akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na ha na-arụ ọrụ enyemaka gbasara iwu. Ọ bụrụ na ọ nweghị onye ọka iwu ịma ma ọ bụ na enweghị ike ịkpọtụrụ onye ọka iwu ịmaara, ị nwere ike gị na onye ọka iwu nọ n’ọrụ akpaa. Nke a bụ n’efu.
  • Onye ọka iwu nọ n’ọrụ enweghị ihe jikọrọ ya na ndị uwe ojii.

Iji hazie ndụmọdụ gbasara iwu bụ n’efu:

  • Ndị uwe ojii ga-akpọtụrụ Defence Solicitor Call Centre (DSCC). Ndị DSCC ga-ahazi ka enye ndụmọdụ gbasara iwu, nwere ike site na CDS Direct, onye ọka iwu nke ịrịọrịọ ma ọ bụ Onye Ọka iwu nọ ọrụ.
  • Ndị DSCC na CDS Direct bụ ndị ọrụ nọọrọ onwe ha, ọrụ bụ ịhazi ndụmọdụ gbasara iwu n’enweghị ihe ọ bụla gbasara ha na ndị uwe ojii.

Ọ bụrụ na ịchọrọ ịkwụ ụgwọ ndụmọdụ gbasara iwu n’onwe gị:

  • N’okwu niile ị nwere ike ịkwụ ụgwọ ndụmọdụ gbasara iwu ma ọ bụrụ na ịchọrọ.
  • Mgbe ndụmọdụ gbasara iwu jedebere na ndụmọdụ ekwentị sitere na CDS Direct, gị na onye ọka iwu nke ịhọtara ka nwere ike ịkpa n’ekwentị ma ọ bụrụ na ịchọrọ mana ọ bụghị ndị enyemaka ihe gbasara iwu ga-akwụ ụgwọ ya, ma ha nwere ike gwa gị ka ịkwụọ ha ụgwọ. DSCC ga-akpọtụrụ onye ọka iwu gị na nnọchite anya gị.
  • Ị nwere ikike ịchọ ndụmọdụ nzuzo n’aka onye ọka iwu gị n’ekwentị ma ọ bụ ha nwere ike kpebie ịbịa hụ gị n’ọdụ ndị uwe ojii.
  • Ọ bụrụ na enweghị ike ịkpọtụrụ onye ọka iwu nke ịhọtara, ndị uwe ojii ka nwere ike ịkpọ DSCC iji hazie ndụmọdụ gbasara iwu bụ n’efu site n’aka Onye Ọka iwu Nọ Ọrụ.

2. ḷgwa mmadụ na ịnọ n’ọdụ ndị uwe ojii.

  • Ị nwere ike ịgwa ndị uwe ojii ka ha kpọtụrụ onye kwesịrị ịma na ịnọ n’aka ha . Nke a bụ n’efu.
  • Ha ga-akpọrọ gị onye ahụ ozugbo ha nwere ike.

3. Ilebanye anya N’Usoro Ọrụ

  • Usoro ọrụ bụ iwu ndị na-agwa gị ihe onye uwe ojii nwere ike ịme ma ọ bụ nke ọ nweghị ike ịme mgbe ịnọ n’aka ndị uwe ojii. Ha gụnyere nkọwa ikike nke achịkọtara Ọkwa a.
  • Ndị uwe ojii ga-ahapụ gị ka ịgụọ Usoro ọrụ mana ịgaghị agụ ya ruo ogologo oge nke na ọ ga-egbochi onye uwe ojii ịchọpụta ma ịdara iwu.
  • Ọ bụrụ na ịchọrọ ịgụ Usoro ọrụ, gwa Onye Uwe ojii okwu gị dị n’aka ya.

4. Ịnweta enyemaka ahụike ma ọ bụrụ n’ahụ adịghị gị ma ọ bụ na ịmerụrụ ahụ.

  • Gwa onye uwe ojii ma ọ bụrụ na ahụ adịghị gị ma ọ bụ na ịchọrọ ọgwụ ma ọbụ na ịmerụrụ ahụ. Ha ga-akpọ onye dọkịta ma ọ bụ nọọsụ ma ọ bụ onye ọkachamara nlekọta ahụike ndị ọzọ. Nke a bụ n’efu.
  • Enwere ike ịnye gị ohere ka irie ọgwụ nke gị mana onye uwe ojii ga-ebu ụzọ nyocha ya. Onye nọọsụ ga-ebụkarị ụzọ hụ gị , mana onye uwe ojii ga-akpọ dọkịta ma ọ bụrụ na ịchọrọ. Ịnwere ike ịrịọ ka ịhụ dọkịta ọzọ mana ịnwere ike bụrụ onye ga-akwụ ụgwọ nke a.

5. Ikike nke ịnọ juu

Ọ bụrụ na-ajụọ gị ajụjụ gbasara ịda iwu a na-enyo enyo, ị nwere ike ịgaghị ekwu ihe ọ bụla.

Kaosiladị, ọ nwere ike imebi ngọpụta onwe gị ma ọ bụrụ na ikwupụtaghị mgbe ajụrụ gị ajụjụ ihe bụ nke ị ga-atụkwasị obi n’ụlọ ikpe ma emechaa.

Enwere ike iji ihe ọ bụla nke ikwuru nye ya ka akaebe.

6. ḷmata maka ịda iwu nke a na-enyo n’ịdara yana ịmata ihe kpatara eji jide gị ma debekwa gị

  • Ndị uwe ojii ga-agwarịrị gị gbasara ụdị ịda iwu nke ha na-eche n’ịdara. Nke a gụnyere mgbe na ebe ha chere n’ịdara ya.
  • Ndị uwe ojii ga-agwarịrị gị ihe kpatara ha jiri chee n’ịdara iwu ahụ yana ihe kpatara ha ji kwenye na ha kwesịrị ijide gị.
  • N’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, ndị uwe ojii ga-agwarịrị gị ihe kpatara ha jiri kwenye na ekwesịrị ka ejide gị.
  • Tupu ajụọ gị ajụjụ ọ bụla gbasara ịda iwu ọ bụla, ndị uwe ojii ga-enyerịrị gị na onye ọka iwu gị ozi zuru ezu gbasara ihe ndị uwe ojii na-eche na ịmere ka ị nwee ike gọrọ onwe gị, mana ọ bụghị n’oge ị nwere ike imebi nyocha ndị uwe ojii.
  • Nke a metụtara ịda iwu ndị ọzọ nke ndị uwe ojii na-eche n’ịdara.

7. ḷhụ ndekọ na akwụkwọ gbasara njide gị na idebe gị

  • Mgbe ejidere gị,n’ụlọ ndị uwe ojii ndị uwe ojii ga-:
    • Edekọba na ndekọ njide gị, ihe kpatara yana mkpa ọ dị ijide gị yana ihe mere ha ji kwenye na a ga-ejide gị.
    • Ahapụ gị na onye ọka iwu gị ka unu lebaa ndekọ ahụ anya. Onye uwe ojii na-ahụ maka okwu gị ga-ahazi nke a.
  • Nke a metụtara ịda iwu nke ọ bụla nke ndị uwe ojii na-eche n’ịdara.
  • Ndị uwe ojii ga-ahapụrịrị gị ma ọ bụ onye ọka iwu gị ịnweta akwụkwọ na ihe ndị dị mkpa iji nyere aka lụso ọgụ nke ọma njide na ndebe gị ka osiri gbaso iwu.

8. Ịnweta onye ntụgharị na onye nsụgharị okwu maka ntụgharị akwụkwọ ụfọdụ iji nyere gị aka

  • Ọ bụrụ na ịnaghị asụ ma ọ bụ ghọta Bekee, ndị uwe ojii ga-ahazi onye na- asụ asụsụ gị iji nyere gị aka. Nke a bụ n’efu.
  • Ọ bụrụ na nti chiri gị ma ọ bụ na ị nwere nsogbu n’ikwu okwu, ndị uwe ojii ga-ahazi onye ntụgharị okwu Ji Aka Akparịta Ụka nke Britain iji nyere gị aka. Nke a bụ n’efu.
  • Ọ bụrụ na ịnaghị asụ ma ọ bụ ghọta Bekee, ndị uwe ojii ga-achọta onye ntụgharị okwu iji gwa gị ihe kpatara eji jide gị. A ga-eme nke a oge ọ bụla emere mkpebi ịhapụ gị n’ime mkpọrọ.
  • Ka emechara mkpebi nke ọ bụla idobe gị n’ụlọ mkpọrọ yana ka agbachara gị akwụkwọ ebubo ịda iwu ọ bụla, ndị uwe ojii ga-enyerịrị gị ndekọ nke gị n’asụsụ gị, ihe kpatara ejiri jide gị yana ịda iwu nke ejiri gbaa gị akwụkwọ ebubo, beluso ma enwere ihe ndị pụrụiche kpatara ya na agaghị eme nke a. Ndị a bụ:
    • Ọ bụrụ na ikpebie na ịchọghị ndekọ ahụ iji gọrọ onwe gị n’ihi na ịghọtara nke ọma ihe na-eme yana nsonazụ nke enweghị ndekọ ahụ, na ị nweela ohere ịrịọ onye ọka iwu ka ọ nyere gị aka mee mkpebi. Ị ga-enyerịrị nkwenye gị na ederede.
    • Ọ bụrụ na inwe ntụgharị ọnụ okwu ma ọ bụ nchịkọta sitere na onye ntụgharị okwu kama ntụgharị edere ede ga-ezuru gị ịgọrọ onwe gị ma ghọta nke ọma ihe na-eme. Onye na-ahụ maka njide ga-enyekwa ikikere nke a.
  • Mgbe ndị uwe ojii na-ajụ gị ajụjụ na emeghị ndekọ ọdiyo, onye ntụgharị okwu ga-eme ndekọ ajụjụ na azịza ndị ahụ n’asụsụ gị. Ị ga-enwe ike nyocha nke a tupu ibinye aka na ya dịka ndekọ ziri ezi.
  • Ọ bụrụ na ịchọrọ ịnye ndị uwe ojii akwụkwọ akụkọ, onye ntụgharị okwu ga-eme nṅomi akwụkwọ akụkọ ahụ n’asụsụ gị maka gị inyocha wee binye aka dịka nke ziri ezi.
  • Ị nwekwara ikike ị nweta ntụgharị Ọkwa a. Ọ bụrụ na ntụgharị okwu adịghị, a ga-enyerịrị gị ozi ahụ site n’onye ntụgharị okwu ma nye gị ntụgharị okwu n’egbughị oge ọ bụla.

9. ḷkpọtụrụ ụlọ ọrụ ndị nnọchite obodo gị ma ọ bụ kọnsụlet

Ọ bụrụ na ịbụghị onye mba Britain, ị nwere ike gwa ndị uwe ojii na ịchọrọ ịkpọtụrụ Ụlọ ọrụ Isi Obodo gị, Ụlọ ọrụ Nnọchite Obodo gị ma ọ bụ Kọnsụlet iji gwa ha ebe ịnọ na ihe kpatara iji nọrọ n’aka ndị uwe ojii. Ha nwekwara ike bịa leta gị na nzuzo ma ọ bụ hazie ka onye ọka iwu hụ gị.

10. Ogologo oge ole enwere ike ijide gị

  • Enwere ike ijidekarị gị ihe ruru awa 24 n’agbaghị gị akwụkwọ ebubo ọ bụla. Nke a nwere ike tee aka karịa mana ọ bụ naanị ma ọ bụrụ na onye ọka ikpe na ndị na-eke ikpe n’ụlọ ikpe ukwuu nwere ike ịnụrụ ịda iwu ahụ ma Onye Uwe ojii Suprịtendant ma ọ bụ ụlọ ikpe kwere ka nke a mee. Ka awa 36 gachara, naanị ụlọ ikpe nwere ike inyekwu ndị uwe ojii oge ijide gị n’agbaghị gị akwụkwọ ebubo.
  • Kwa mgbe, kwa mgbe onye isi na ndị uwe ojii ga-elebanye anya n’okwu gị iji hụ ma ọ ka kwesịrị ka edobe gị n’aka ndị uwe ojii. A na- akpọ nke a nyocha. Naanị ma ọ bụrụ na ịnọghị n’ọnọdụ ahụ izu oke, ị nwere ikike ikwu okwu banyere mkpebi a. Onye ọka iwu gị nwekwara ikike ikwu okwu banyere nke a na nnọchite anya gị.
  • Ọ bụrụ na onye ọrụ nyocha ahapụghị gị, a ga-agwarịrị gị ihe kpatara ya ma dekọba ihe kpatara ya na ndekọ njide gị.
  • Ọ bụrụ na njide gị adịghị mkpa, a ga-ahapụrịrị gị. Ọ bụrụ na ndị uwe ojii ka chọrọ ịganihu ime nyocha ịda iwu ahụ, enwere ike ijiri ego gbapụta gị ma ọ bụ agaghị eji ego gbapụta gị. Ọ bụrụ na agbapụta gị, a ga-enyerịrị gị ọkwa edere ede iji gwa gị na ịga abịaghachirịrị n’ụlọ ndị uwe ọjii yana ọnọdụ ndị ọ bụla metụtara mgbapụta gị
  • Mgbe ndị uwe ojii rịọrịọ ụlọ ikpe ka ha gbatịa njide gị:
    • A ga-edoteriri gị n’ụlọ ikpe maka ikpe ahụ belụsọ na atọlitere njikọ igwe onyonyoo, ka ị nwee ike ịhụ ma nụ ndị mmadụ nọ n’ụlọ ikpe, ha enwekwaa ike ịhụ ma nụ gị.
    • Enweghị ike ịtọlite njikọ igwe onyonyoo belụsọ na onye ụlọ mkpọrọ ahụrụ ya ka ihe ziri ezi, onye ọka iwu enyela gị ndụmọdụ gbasara ojiji ya, ma ị nyela nkwenye gị.
    • A ga-enyerịrị gị akwụkwọ ga-agwa ụlọ ikpe gbasara akaebe na ihe kpatara ndị uwe ojii jiri chọọ idobe gị n’ụlọ mkpọrọ.
    • Ị nwere ikike ịnwe onye ọka iwu oge ịnọ n’ụlọ ikpe.
    • A ga-enye ndị uwe ojii ohere idobe gị n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụrụ na ụlọ ikpe ekwenye na ọ dị mkpa yana na ndị uwe ojii ji mkpachapụ anya enyocha okwu gị n’etufughị oge.
  • Ọ bụrụ na ndị uwe ojii nwere akaebe zuru oke iji zipu gị ụlọ ikpe, enwere ike gbaa gị akwụkwọ ebubo n’aka ndị uwe ojii ma ọ bụ site na nzipu leta, ka ịbịa n’ụlọ ikpe ka anụrụ ikpe gị.

11. Ohere nnweta akaebe ma ọ bụrụ na okwu gị pụọ n’ụlọ ikpe.

Ọ bụrụ na agba gị akwụkwọ ebubo ịda iwu, a ga-ahapụrịrị gị ma ọ bụ onye ọka iwu gị ka ọ hụ akaebe ahụ megidere gị yana akaebe nke nwere ike ịnyere gị aka gọrọ onwe gị. A ga-emerịrị nke a tupu nnụrụ ikpe amalite. Ọ bụ ọrụ ndị uwe ojii na ndị ọrụ Crown Prosecution ịhazi nke a ma nye ohere nnweta akwụkwọ na ihe ndị dị mkpa.

Ihe ndị ọzọ ị ga-amata gbasara ịnọ n’aka ndị uwe ojii

Otu ekwesịrị isi meso gị omume ma lekọta gị

Ndị a bụ ihe ole na ole ederede gbasara ihe ịnwere ike ịtụ anya ya ka n’aka ndị uwe ojii. Iji chọpụtakwuo, rịọ ka ịhụ Usoro ọrụ Ha gụnyere ndepụta ebe ịga ahụ ọtụtụ ozi gbasara nke ọ bụla n’ime ndị a. Jụọ onye uwe ojii na-ahụ maka okwu gị ma ọ bụrụ na ị nwere ajụjụ ọ bụla.

Ndị chọrọ enyemaka

  • Ọ bụrụ na irubeghị 18 ma ọ bụ izuchaghị ezu, ọmụmatụ ọ bụrụ na ị nwere nsogbu ịmụta ihe ma ọ bụ nsogbu ahụike ọgụgụ isi, yabụ na ị nwere ikike ka gị na mmadụ nọrọ mgbe ndị uwe ojii na-eme ụfọdụ ihe. Onye a ka a na-akpọ “okenye tozuru etozu” nke gị yana a ga-enye ha ṅomi nke Ọkwa a.
  • Okenye gị tozuru etozu ga-anọnyerịrị gị mgbe ndị uwe ojii na-agwa gị gbasara ikike gị ma gwa gị ihe kpatara eji dobe gị n’aka ndị uwe ojii. Onye ahụ ga- anọnyerịrị gị mgbe ndị uwe ojii na-agụpụtara gị ịdọ aka ntị ndị uwe ojii.
  • Okenye gị tozuru etozu nwekwara ike rịọ maka onye ọka iwu na nnọchite anya gị.
  • Ị nwere ike ịgwa onye ọka iwu gị okwu n’enweghị okenye gị tozuru etozu n’ịme ụlọ ahụ ma ọ bụrụ na ịchọrọ.
  • Ndị uwe ojii nwekwara ike ịme otu n’ime ihe ndị edepụtara n’okpuru ka ịnọ n’aka ha. Okenye gị tozuru etozu ga-anọnyerịrị gị mgbe niile, naanị mọbụrụ na enwere ihe pụrụiche kpatara ya ma ọ bụrụ na ndị uwe ojii na-eme otu n’ime ihe ndị a :
    • ḷjụ gị ajụjụ ma ọ bụ sị gị binye aka n’akwụkwọ akụkọ edere ede ma ọ bụ akwụkwọ ndetu onye uwe ojii.
    • Iyipu ihe karịrị otu akwa mpụga gị iji mee gị nyocha.
    • Nara mbisa mkpịsị aka gị, foto ma ọ bụ ndekọ DNA ma ọ bụ ihe nlele ọzọ.
    • ḷme ihe ọ bụla metụtara usoro nchọpụta onye akaebe hụrụ ihe mere.
  • Okenye gị tozuru etozu kwesịrị ka enye ya ohere ka ọ nọrọ n’onwe ya ma ọ bụ n’ekwentị, mgbe ndị uwe ojii na-enyocha okwu gị iji hụ ma ekwesịrị ịgaba n’ihu jide gị.
  • Ọ bụrụ na okenye gị tozuru etozu nọ, ha ga-anọrịrị mgbe ndị uwe ojii na-agba gị akwụkwọ ebubo maka ịda iwu.

Ịnweta nkọwapụta oge gị n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii

  • A na-edekọba ihe niile nke mere gị mgbe ịnọ n’aka ndị uwe ojii. Nke a ka a na- akpọ Ndekọ Njide.
  • Mgbe ịhapụrụ ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, gị, onye ọka iwu gị ma ọ bụ okenye gị tozuru etozu nwere ike ịrịọ maka akwụkwọ Ndekọ Njide gị. Ndị uwe ojii ga-enye gị ya gị ozugbo ha nwere ike.
  • Ị nwere ike ịjụ ndị uwe ojii maka akwụkwọ Ndekọ Njide gị ruo ọnwa 12 ka ịhapụchara ụlọ ndị uwe ojii .

Na akpọtụrụ

  • N’ikwuru onye ọka iwu yana ịgwa mmadụ gbasara njide emere gị, a na-ahapụkarị gị ka ịmee otu oku ekwentị.
  • Rịọ ndị uwe ojii ma ọ bụrụ na ịchọrọ ịkpọ oku ekwentị.
  • Ị nwekwara ike ịrịọ maka mkpịsị edemede na akwụkwọ.
  • Ị nwere ike nwee ohere ịnabata ndị ọbịa mana onye na-ahụ maka okwu gị nwere ike jụ ịnabata nke ahụ.

Ụlọ mkpọrọ gị

  • Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ọmụme, ekwesịrị idobe gị n’ụlọ mkpọrọ nke gị.
  • Ọ kwesịrị ịdị ọcha, nwee okpomọkụ ma nwee ọkụ.
  • Ihe mgbakwasa akwa gị kwesịrị ịdị ọcha ma dị n’ọnọdụ dị mma.
  • Ekwesịrị ka ahapụ gị ka ijiri ụlọ mposi ma sachaa ahụ.

Akwa

Ọ bụrụ na anara gị akwa gị, mgbe ahụ ndị uwe ojii ga-enyerịrị gị ụdị akwa ọzọ.

Nri na ihe ọṅụṅụ

A ga-enyerịrị gị nri ugboro 3 n’ụbọchị yana ihe ọṅụṅụ. Ị nwekwara ike ịṅụ ihe ọṅụṅụ n’etiti nri.

Mgbatị ahụ

Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ọmụme, ekwesịrị ịhapụ gị ka ịpụọ ezi kwa ụbọchị nara ikuku ọma.

Mgbe ndị uwe ojii na-ajụ gị ajụjụ

  • Ime ụlọ ahụ kwesịrị ịdị ọcha, nwee okpomọkụ ma nwee ọkụ.
  • Ọ kwesịghị na ị ga-akwụ ọtọ.
  • Ndị uwe ojii ahụ kwesịrị ịgwa gị aha ha na ọkwa ha.
  • Ị kwesịrị inwe oge izu ike na oge iri nri na oge ịṅụ ihe ọṅụṅụ ka elekere abụọ gachara.
  • Ekwesịrị ka enye gị ọbụlagodi awa 8 iji rahụ ụra n’ime awa 24 ọ bụla emere gị njide.

Agụụ Okwukwe

Gwa ndị uwe ojii ma ọ bụrụ na ịchọrọ ihe ọ bụla iji nyere gị aka ịme okpukpe gị mgbe ịnọ ha n’aka. Ha nwere ike ịnye gị akwụkwọ ụka na ihe ndị ọzọ , ka o siri dị mkpa.

Oge iwu nkịtị na-adị iche

Inweta onye ọka iwu ka onyere gị aka

A na-enwe oge pụrụiche mgbe ndị uwe ojii ga-achọ ịjụ gị ajụjụ ọsọ ọsọ tupu gị na onye ọka iwu gị akpakọrịta. Enyere ozi gbasara oge pụrụiche ndị a na Usoro iwu ọrụ . Ndị a, na-edepụta ihe ndị uwe ojii nwere ike ime na nke ha enweghị ike ịme ka ịnọ n’aka ndị uwe ojii. Ọ bụrụ na ịchọrọ ịlebanye anya na nkọwapụta ha, ha dị na nkeji akwụkwọ 6.6 nke Koodu C nke Usoro iwu ọrụ.

Ọnwere oge pụrụiche mgbe ndị uwe ojii agaghị ekwe ka gị na onye ọka iwu ịhọpụtara kpakọrịta. Ọ bụrụ na nke a mee, a ga-ahapụrịrị gị ka ịhọrọ onye ọka iwu ọzọ. Ọ bụrụ na ịchọrọ ịlebanye anya na nkọwapụta ha, ọ dị na Mgbakwunye B nke Koodu C nke Usoro iwu ọrụ.

ḷgwa mmadụ na ịnọ n’aka ndị uwe ojii

Enwere oge pụrụiche mgbe ndị uwe ojii agaghị ekwe ka ịkpọtụrụ onye ọ bụla. Enyere ozi gbasara oge ndị a pụrụiche na Usoro iwu ọrụ . Ọ bụrụ na ịchọrọ ịlebanye anya na nkọwapụta ha, ọ dị na Mgbakwunye B nke Koodu C nke Usoro ọrụ.

Nlele ume

Ọ bụrụ na anwudoro gị n’ihi ịda iwu ịṅụ mmanya were akwọ ụgbọ, ị nwere ikike ikwuru onye ọka iwu. Ikike ahụ apụtaghị na ị nwere ike jụ inye onye uwe ojii nlele ume gị, ọbara na mmamịrị ọbụlagodi na gị n’onye ọka iwu ekwubeghị.

Njide n’okpuru Amụma Iwu Ahụike Ọgụgụ Isi 1983

Ndị uwe ojii nwere ike jide mmadụ n’ụlọ ọrụ ha maka nyocha n’okpuru Amụma Iwu Ahụike Ọgụgụ Isi. Ọ bụrụ na ejidere gị n’okpuru Amụma Iwu Ahụike Ọgụgụ Isi, nke a apụtaghị na-anwudoro gị maka ịda iwu.

Nke a pụtara na ndị uwe ojii ga-ahazirịrị ka dọkịta hụ gị yana ka Onye Ọkachamara Ahụike Ọgụgụ Isi Akwadoro tozuru etozu mee nyocha. A ga- enyocharịrị gị n’ime awa 72 (n’ụbọchị 3) nke mbata gị n’aka ndị uwe ojii ahụ mana ndị uwe ojii ga-anwa hazie nke a ozugbo enwere ike. N’ime oge a, ndị uwe ojii nwere ike ibufe gị n’ebe dị mma iji mee ka nyocha gaa nke ọma.

Mgbe ị na-eche nyocha gị, ndị uwe ojii nwere ike ịhazi ka Onye Nlekọta Ahụike Akwadoro hụ gị. Ha enweghị ike ịme nyocha ahụ mana ha ga-enyere gị aka na nsogbu ahụike ọzọ ị nwere ike nwee ma nyere aka kọwaa ihe nyocha ahụ pụtara.

Ndị Ọbịa Ndị Eji Eji Nọrọ Onwe ha

Enwere ndị ọbịa bi n’ogbe a na-enye ohere ịbata n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii n‘amaghị ọkwa. Amaara ha dịka ndị ọbịa ndị eji eji nọrọ onwe ha, ha na-arụ ọrụ akwụ ụgwọ ka ewere hụ na a na-elekọta ndị eji eji nke ọma ma nwee ike nweta ikike ha.

Inweghị ikike ọ bụla ịhụ onye ọbịa ndị eji eji nọrọ onwe ma ọ bụ ịrịọ ha ka ha bịa leta gị mana onye ọbịa nwere ike ịrịọ ka ọ bịa leta gị. Ọ bụrụ na onye ọbịa ndị eji eji nọrọ onwe ha abịa leta gị mgbe ịnọ na mkpọrọ, ha na-emere onwe ha nke a n’enweghị mkpakọ n’etiti ha na ndị uwe ojii iji hụ na echedoro ọdịmma gị na ikike gị. Agbanyeghị, ọ bụghị iwu na ị ga-agwa ha okwu ma ọ bụrụ na ịchọghị.

Otu esi eme mkpesa

Ọ bụrụ na ịchọrọ ịkpesa gbasara otu esiri meso gị omume, rịọ ka gị na onye uwe ojii bụ ịnspektọ ma ọ bụ ọkwa karịrị kpakọrịta. Mgbe ahapụchara gị, ịnwekwara ike ịme mkpesa n’ọdụ ndị uwe ojii ọ bụla n’aka Independent Police Complaints Commission (IPCC) ma ọ bụ site n’onye ọka iwu ma ọ bụ MP gị na nnọchite anya gị.